1 Chineke, were aha-Gi zọputam,Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe.
2 Chineke, nuru ekperem;Ṅa nti n'okwu nile nke ọnum.
3 N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem,Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim:Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah
4 Le, Chineke bu onye nēyerem aka:Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ndi nākwagide nkpuru-obim.
5 Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha:Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.