1 Ge nti n'ekperem, Chineke;Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram.
2 Ṅam nti, zam:Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude;
3 N'ihi olu onye-iro,N'ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu;N'ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem,Ọ bu kwa n'iwe ka ha nākpọm asì.
4 O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem:Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.
5 Egwu na ima-jijiji nābiarum aru,Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.
6 M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru!M'gēfela, we nọdu du.