13 Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.
14 Ayi nāb͕akọri ìzù utọ,N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.
15 Ka ọnwu biakwasi ha na mberede,Ka ha ridarue ala-mọ na ndu:N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.
16 Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku;Jehova gāzọputakwam.
17 Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude:Ọ gānu kwa olum.
18 Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso:N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.
19 Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala,Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. SelahHa bu ndi nēnweghi nb͕anwe,Ha adighi-atu kwa egwu Chineke.