4 O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem:Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.
5 Egwu na ima-jijiji nābiarum aru,Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.
6 M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru!M'gēfela, we nọdu du.
7 Le, m'gēferu ebe di anya,Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah
8 M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufeBiarue ebe-nb͕apu dirim.
9 Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.
10 N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile:Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.