2 Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile:N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu.
3 N'ubọchi m'nātu egwu,Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi.
4 Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya:Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu;Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?
5 Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile:N'imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ.
6 Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha,Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya,Dika ha leworo anya nkpuru-obim.
7 Ọ̀ bu n'ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu?N'iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke.
8 Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu:Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi;Hà adighi n'akwukwọ-Gi: