13 Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ:Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob,Rue nsọtu nile nke uwa. Selah
14 Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,Nāga obodo buruburu.
15 Ndi ahu nāṅaghari iri ihe,Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.
16 Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi;E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu:N'ihi na I buruworom ulo-elu,Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim.