5 Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel,Teta ileta mba nile:Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah
6 Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,Nāga obodo buruburu.
7 Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu;Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha:N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.
8 Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì;I gākwa mba nile emò.
9 Ikem, Gi ka m'gēlezi anya:N'ihi na Chineke bu ulo-elum.
10 Chineke nke eberem gābia izutem:Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.
11 Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ:Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida,Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.