1 Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi,I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.
2 I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya:Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.
3 I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike:I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.
4 I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ,Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah
5 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya,Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.