2 I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya:Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.
3 I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike:I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.
4 I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ,Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah
5 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya,Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.
6 Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha:M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.
7 Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase;Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;Juda bu nkpa-n'aka-ezem.
8 Moab bu ite ọsisa-arum;N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:Filistia, tie nkpu n'ihim.