7 Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase;Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;Juda bu nkpa-n'aka-ezem.
8 Moab bu ite ọsisa-arum;N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:Filistia, tie nkpu n'ihim.
9 Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike?Ònye duruworom rue Edom?
10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju?I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.
11 Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u:N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.