1 Chineke, nuru olu iti-nkpum;Ṅa nti ekperem.
2 M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike:Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je.
3 N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà,Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro.
4 Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi:M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah