2 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum ri nne.
3 Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu?Unu nētipia ya, unu nile,Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.
4 Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù;Okwu-ugha nātọ ha utọ:Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n'ime obi-ha ha nākọcha akọcha. Selah
5 Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim;N'ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta.
6 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.
7 N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di:Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.
8 Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya;Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri:Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah