6 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.
7 N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di:Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.
8 Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya;Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri:Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah
9 Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu,ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu:N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe;Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.
10 Unu atukwasila obi na nmeb͕u,Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu:Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.
11 Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu,Ub͕ò abua ka m'nuworo nka;Na ike nile bu ihe Chineke nwere: