1 Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike:Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike,N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.
2 Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi,Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi.
3 N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu;Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi.
4 Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu:N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu.
5 Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ;Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi;
6 Ọ buru na echetam I n'elu utem,Nime nche-abali nile ka m'nātughari uchem na Gi.