1 Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi,Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah
2 Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa,Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.
3 Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke;Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
4 Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù:N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi,Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah