10 Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya:I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke.
11 Onye-nwe-ayi nēnye okwu:Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.
12 Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga:Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha.
13 Ọ buru na unu edina n'etiti ogige-aturu,Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie,Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua.
14 Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya,Snow nēzò na Zalmon.
15 Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu;Ugwu nwere ugwu di iche iche n'elu ya ka ugwu Beshan bu.
16 Unu ugwu nwere ugwu n'elu unu, n'ìhi gini ka unu ji ekworoLe ugwu ahu anya nke Chineke chọsiworo ike ibu ebe-obibi-Ya?E, Jehova gēbi nime ya rue mb͕e ebighi-ebi.