19 Onye agọziri agọzi ka Onye-nwe-ayi bu, kwa-ubọchi ka Ọ nēburu ayi ibu,Bú Chineke Nke bu nzọputa-ayi. Selah
20 Chineke buru ayi Chineke nāzọputa azọputa;Ọ bu kwa Johova, bú Onye-nwe-ayi, nwe uzọ nile isi n'ọnwu pua.
21 Ọ bu nání na Chineke gēb͕upú isi ndi-iro-Ya,Bú opu-n'isi arapuru ndundu nke onye nējeghari n'ikpe-ọmuma-ya.
22 Onye-nwe-ayi siri, M'gēme ka ha si na Beshan lata,M'gēme ka ha si n'ebe nile di omimi nke oké osimiri lata:
23 Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara,Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.
24 Ha ahuwo ojije-Gi nile, Chineke,Bú ojije nile nke Chinekem, bú Ezem, n'idi-nsọ-Ya.
25 Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu,N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.