8 Ala mara jijiji,Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke:Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel.
9 Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke,Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike.
10 Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya:I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke.
11 Onye-nwe-ayi nēnye okwu:Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.
12 Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga:Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha.
13 Ọ buru na unu edina n'etiti ogige-aturu,Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie,Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua.
14 Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya,Snow nēzò na Zalmon.