13 Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ:Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi,Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.
14 Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe.Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi.
15 Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum,Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam;Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya.
16 Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma:Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru.
17 Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi;N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.
18 Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya:N'ihi ndi-irom b͕aputam.
19 Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem:N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.