2 Emikpuwom n'urọ nke ebe di omimi, ọ dighi kwa ebe-nguzo di:Abatawom na miri nke miri emi, miri nke nērù ọku ọku na-enudakwa m.
3 Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku:Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem.
4 Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu:Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha:Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike.
5 Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ;Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile.
6 Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha:Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel.
7 N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta;Ihere ekpuchiwo irum.
8 Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ,Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.