26 N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo;Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.
27 Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha:Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi.
28 Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu,Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.
29 Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u:Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu.
30 M'gēji abù to aha Chineke,M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku.
31 Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi,Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa.
32 Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri:Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu.