7 N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta;Ihere ekpuchiwo irum.
8 Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ,Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.
9 N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom;Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam.
10 M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim,O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.
11 Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem,M'we ghọrọ ha ilu.
12 Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem;Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara.
13 Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ:Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi,Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.