1 Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo:Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha:
2 Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.
3 Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua;
4 Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ;(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)