11 Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume,Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.
12 Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.
13 Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.
14 Le, ime ajọ ihe nēme ya;Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.
15 Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya,O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme.
16 Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya,Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.