2 O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe,O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala.
3 Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo,Ugwu ntà kwa, n'ezi omume.
4 Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe,Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa,Zọpia kwa onye-nmeb͕u.
5 Ha ganātu egwu Gi ogologo mb͕e anyanwu gādigide,Na n'iru ọnwa, rue ọb͕ọ nile.
6 Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu:Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.
7 Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu;Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.
8 Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ,Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.