7 Onye ezi omume gāma akwukwọ n'ubọchi nile ya dika osisi ndu;Ọtutu udo gādi kwa rue mb͕e ọnwa agaghi-adi.
8 Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ,Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.
9 Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya;Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.
10 Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma:Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.
11 E, eze nile gākpọ isi ala nye ya:Mba nile gēfè ya òfùfè.
12 N'ihi na ọ gānaputa ob͕eye mb͕e o nētiku ya;Ọ gānaputa kwa onye ewedara n'ala mb͕e ọ dighi onye nēyere ya aka.
13 Ọ gēmere onye nēnweghi ike na ob͕eye ebere,Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ob͕eye ka ọ gāzọputa.