1 N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ,Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ.
2 Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha;Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu.
3 N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo,Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu.
4 N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha:Ma aru-ha mara abuba.
5 Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ;Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile.
6 N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu;Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.