14 Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile,Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.
15 Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a;Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori.
16 M'we chè èchìchè imata nka,Ndọb͕u-onwem-n'ọlu ka ọ bu n'anyam;
17 Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke,Ghọta ikpe-azu-ha.
18 N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha:I mewo ka ha darue ntikpọ.
19 Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya?Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.
20 Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura;Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.