17 Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke,Ghọta ikpe-azu-ha.
18 N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha:I mewo ka ha darue ntikpọ.
19 Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya?Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.
20 Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura;Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.
21 N'ihi na obim nāb͕ari uka,Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua.
22 Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe;Nání anu ka m'buworo n'iru Gi.
23 Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile:I jidewo aka-nrim.