4 N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha:Ma aru-ha mara abuba.
5 Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ;Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile.
6 N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu;Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.
7 Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa:Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.
8 Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ:Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu.
9 Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe,Ire-ha nējeghari kwa n'uwa.
10 N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a,Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.