7 Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa:Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.
8 Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ:Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu.
9 Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe,Ire-ha nējeghari kwa n'uwa.
10 N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a,Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.
11 Ha we si, Chìneke si aṅa mara?Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?
12 Le, ndia bu ndi nēmebi iwu;Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.
13 Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha,N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ;