9 Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe,Ire-ha nējeghari kwa n'uwa.
10 N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a,Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.
11 Ha we si, Chìneke si aṅa mara?Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?
12 Le, ndia bu ndi nēmebi iwu;Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.
13 Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha,N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ;
14 Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile,Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.
15 Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a;Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori.