11 N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi?Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia.
12 Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie,Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa
13 Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri:I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.
14 Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi,I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku.
15 Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi:Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.
16 Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali:Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.
17 Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ:Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.