15 Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi:Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.
16 Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali:Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.
17 Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ:Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.
18 Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta,Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi.
19 Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi:Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi.
20 Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi:N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike.
21 Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere:Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi.