3 Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi;Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ.
4 Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi;Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama,
5 Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-ukuN'alùghi-ulù nke osisi.
6 Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u,Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù.
7 Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku;Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ.
8 Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù:Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala.
9 Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi:Ọ dighi onye-amuma di ọzọ;Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.