8 Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù:Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala.
9 Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi:Ọ dighi onye-amuma di ọzọ;Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.
10 Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta?Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi?
11 N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi?Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia.
12 Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie,Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa
13 Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri:I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.
14 Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi,I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku.