1 Ayi ekelewo Gi, Chineke;Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso:Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.
2 Mb͕e m'gānara mb͕e akara àkà,Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi.
3 Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu:Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah
4 Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi:Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu:
5 Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu;Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu.