2 Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.
3 N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta;Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah
4 Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru.
5 Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha;Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.
6 Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob,Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.
7 Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu:Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?
8 I siri n'elu-igwe me ka anuru okwu ikpé;Uwa turu egwu, we di jū,