1 Ndim, ǹanu nti n'iwum:Tọnu nti n'ala inu okwu nile nke ọnum.
2 M'gāsaghe ọnum n'itu ilu:M'gēkwuwa okwu-omimi di iche iche n'uba, bú nke sitere na mb͕e ochie:
3 Nke ayi nuworo mara kwa,Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.
4 Ayi agaghi-ezonari ha na nti umu-ha,Nākọrọ ọb͕ọ nke gādi n'iru akukọ otuto nile nke Jehova,Na ike-Ya, na oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo.