10 Ha edebeghi ọb͕ub͕a-ndu Chineke,Ma ha juru ijeghari n'iwu-Ya;
11 Ha we chezọ omume-Ya nile,Na oké ọlu-Ya nile nke O mere ka ha hu.
12 N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu,N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.
13 O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.
14 O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.
15 Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.
16 O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.