48 O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé,Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku.
49 Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha,Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u,Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.
50 Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya;O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu,Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe;
51 O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt,Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:
52 O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu,Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.
53 O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu:Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.
54 O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya,Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.