53 O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu:Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.
54 O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya,Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.
55 Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha,We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua,O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha.
56 Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya,Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;
57 Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha:Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.
58 Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe,Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.
59 Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè,Jusie Israel ike: