60 O we rapu ebe-obibi nke Shailo,Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu;
61 O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha,Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.
62 O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha;Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.
63 Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.
64 Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.
65 Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.
66 O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu:Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.