66 O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu:Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.
67 Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef,Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;
68 Kama Ọ rọputara ebo Juda,Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.
69 O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu,Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
70 Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya,O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya:
71 O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia,Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.