1 Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi;Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ;Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.
2 Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri,Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.
3 Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem;Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.
4 Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.