2 Ha ewerewo ozu ndi-orù-Gi nye iburu anu-ufe nke elu-igwe ihe-oriri,Were kwa anu-aru nke ndi-ebere-Gi nye anu-ọhia nile nke uwa.
3 Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem;Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.
4 Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.
5 Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi?Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?
6 Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.
7 N'ihi na ha eripiawo Jekob,Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.
8 Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.