9 Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi:Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.
10 N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ?Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi,Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.
11 Kwe ka isu-ude nke onye-nkpọro bata n'iru Gi;Dika idi-uku nke ogwe-aka-Gi si di me ka ndi nāghaghi inwu anwu fọdu;
12 Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa,Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.