1 Tikuenu Chineke, bú ike-ayi, nkpu ọṅụ:Tikusienu Chineke nke Jekob nkpu ọṅụ ike.
2 Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti,Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.
3 Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu,N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.
4 N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu,Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.
5 Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya,Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt:Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu.
6 Ewezugaram ubu-ya n'ibu:Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga.