2 Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti,Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.
3 Fùanu opì-ike n'ọnwa ọhu,N'ọnwa ndọzu, n'ubọchi ememe-ayi.
4 N'ihi na ukpuru enyere Israel ka ọ bu,Ọ bu ikpe Chineke nke Jekob kpere.
5 Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya,Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt:Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu.
6 Ewezugaram ubu-ya n'ibu:Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga.
7 Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi;Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe;Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah
8 Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi:Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!