5 Ihe-àmà nime Josef ka O doro ya,Mb͕e Ọ putara imegide ala Ijipt:Ọ bu okwu-ọnu nke otù onye m'nāmaghi ka m'nānu.
6 Ewezugaram ubu-ya n'ibu:Ọbu-aka-ya abua nēsi n'abọ gabiga.
7 Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi;Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe;Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah
8 Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi:Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!
9 Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi;I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.
10 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi,Nke nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa:Meghe ọnu-gi ka ọ sa mbara, M'gēmeju kwa ya.
11 Ma ndim egeghi nti olum;Israel ekweghikwam.